Onwu abughi njedebe, kama o bu mgbanwe na ezumike
Ife-emelu-mma ka e ji mara gi. Onye a na-ekwu maka ya bu nna anyi. O di anyi obi nwute na Onye-nwe-anyi akporogo gi hapu uwa a. Agbanyeghi ihe megasiri tupu I hapu uwa a, anyi aghaghi inye Chukwu ekene maka ndu I biri. Ka e si kooro m, ihe siere gi na umunne gi ike na nwata. I toputere je gbaa boyi. I rubere isi, gbakwazia mbo were muta ahia. Emesia, I buru onye zuwara ahia nke onwe ya. Chukwu nyeere aka o gaziere gi. I gbaketeho umunne na umunna gi azu. Kama i nyekwaara aka otu I nwere ike ka ha topute mmadu. Na njemu gi n’uwa a I jekwutere nne anyi. Unu abuo ewere tukoo aka muo anyi asaa, nwoke ano, nwanyi ato. I nwakwara ike gi n`ebe anyi no. Enweghi ihe e ji atunyere ndu anyi na nwata na ndu gi na umunne gi biri oge unu di obere. Nke a gosiri na ezi oganihu batara na ndu gi were si na ya rute anyi aka. Daddy, anyi ajaa gi ike. Ka anyi na-eto, i kwadoro anyi na igu akwukwo ma kuziere anyi ihe bu igbasi mbo ike n’ihe obuna anyi na-eme. Igbo si na agwo aghaghi imu ihe toro ogologo. Okwu a banyere ofuma maka na anyi mutara omume gi. Agaghi m asi na ndu gi enweghi ntupo. Kama ka o sina di, anyi mutara ezi ihe n’aka gi. Ndi ozo na adichaghi mma buzi anyi ka o diiri isikwa na ha muru ako. Ekwugo maka ututu na ehihie gi n’uwa a. Ugbua buzi maka mgbede na anyasi ndu gi. Ihe di ka afo ise gara aga ka i dabara na ahu mgbu. Ahu mgbu di ma dikwa. Nke dakwutere gi metutara ako na uche gi. O buru na-enyere m ikike ihara nke gaara idakwute gi, a ka m ahoro nke nile nwere ike imetuta ahu gi, agbanyeghi udi njo ha joro, ma ha hapu ako na uche gi. Okwu a gosiri udi obi nwute na mgbagwoju anya ahu mgbu gi nwere n’ebe m no. O chiputara anyi ukwu n’ezi. Akuko were karia. Ikuku kukwuonu, afu ike okuko. O bu eziokwu na onweghi ihe eji atunyere ndu. Mana Onye-nwe-anyi na-enesi anya ka ihe si kwuru kpopu mmadu n’uwa a. Anyi gbakwaranu mbo ka anyi nwere ike. Onye kachakwanu gbaa mbo bu nwunye gi, Jacinta. Ututu, ehihie na abali o na-enete gi anya. O buho ihe nile ka a ga-akocha odoo ndi akooro ya anya. Na mmechi, Ife-emelu-mma i bigo oke gi n’uwa a. Chukwu gozikwara gi, o bunadi site na ezinulo gi ma ebe i siri kpata ihe i jiri tuo ndu gi mmanu. Anyi bu ndi i hapuru ga-ejetofu nke anyi. Onwu abughi njedebe. I gbanwego banye n’udi anyi anaghi ahu anya. Anu ahu gi ka anyi ga-adonyezi n’ala ka i were zube ike. Ekpere anyi bu ka Chineke meere gi ebere ma nye gi ezumike ebebe. Onye dere ihe a bu Okechukwu Efobi, nwa ya nke ano. Afa onye edere maka ya bu Chukwulota Victor Efobi.