ForeverMissed
Large image
Stories

Share a special moment from Sir Jonah's life.

Write a story

Ekene na Ndumodu – by Sir Jonah O Madu (OkechikerePosted on December 11, 2010 by apuusa)

August 3, 2013

Izuogu Kwenu
Iheme Kwenu
Aro Kwenu
Igbo Kwezuenu
Umu nwanyi ori ihe ori ihe
Asim ka mkene unu nogbako unu neme, obim dim uto. Onye nwe anyi nonyere unu ngbe unu neri nanu, Amen. Dika okenye siri obodo Nigeria bia, ogadi m nma ka m’nyetu nwa ntakiri ndu modu, nihi na ndi turu inu nasi na mgbe onye nna ya di ndu, nadu nwaya odu, ka n’nwa nna ya anoghi ndu namuta ihe. a. Na atu n egwu Chineke nihie obula unu neme. b. Unu echezona obodo unu, nihi na ebe amuru madu, ka ama aha ya. Na atu utu eji alu olu di na obodo gi. Ndi obodo gi gama gi, site ni ihe ina aluru ha. Ndi guru nwa aha guru Ahamuefula. Ekwela ka aha gi fue. c. Umu anyi muru nobodo America: Oburu na ogekwe mee, ogadi nma ka unu chikota umu unu nonuma, nonuma, ebe aga nezi ha asusu Igbo. Lee ebe ndi Yoruba no, ha ganasu asusu Yoruba. Site naya, odighi onye Yoruba muru nwa, nwaya agaghi anu asusu Yoruba. Oburu na umu ayi muru nebea nanu asusu ayi, ogamasi ha iso ayi eje Ndizuogu. Nihi na ha matakwa asusu ayi ha amatakwa ihe ndi ozo. Egwu natum no ogaghi elu otu okara nime okara iri geso anaghachi Ndizuogu nihi anagh aghota asusu Igbo. Nihi nka, anam ario ka unu jisie ike me ka umu ayi soro ayi buru umu Izuogu. Na nmechi, a. Anam ekene unu nimekota ihie notu. Nekelekwa ndi nine ma ndi biara letam, ma ndi najutu kwam site na fone. Anam ekene unu nine tumadi Mazi Kanu Kanu, Mazi Obioha Kanu, Mazi Larry na Agbonma Alisa, Mazi CY na Oby Ezekwem, Mazi Obi Uche, Mazi Tony Nwafor, Lady Chinyere Igbudu, Dr. & Mrs. Obinna Ozigbo na Mazi na Oriaku Mark na Kate Anagboso. b. Ka onye nwanyi Chineke were amara ya na udo ya nedu unu site naha Jesus Christ. Amen.

Page 2 of 2

Share a story

 
Add a document, picture, song, or video
Add an attachment Add a media attachment to your story
You can illustrate your story with a photo, video, song, or PDF document attachment.